31 Iko-ya nwayi nke nọ na Shekem, ya onwe-ya mu-kwa-ra ya nwa-nwoke, ọ gua ya aha Abimelek.
32 Gideon nwa Joash we nwua n'ezi isi-awọ, elìe ya n'ílì Joash, bú nna-ya, n'Ọfra nke ndi Abieza.
33 O rue, mb͕e Gideon nwuru, na umu Israel laghachiri, soro Bealim nākwa iko, doro onwe-ha Beal-berit ka ọ buru chi.
34 Ma umu Israel echetaghi Jehova, bú Chineke-ha, Onye nānaputa ha n'aka ndi-iro-ha nile buruburu:
35 ha emeghi kwa ulo Jerubeal, bú Gideon, ebere, dika ezi ihe nile si di nke o mere Israel.