29 Ma ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ndi nka nọ n'akam! m'gēwezuga kwa Abimelek. O we si Abimelek, Me ka usu-ndi-agha-gi ba uba, gi puta kwa.
30 Zebul, bú onye-isi obodo ahu, we nu okwu nile nke Geal nwa Ebed, iwe-ya we di ọku.
31 O we zigara Abimelek ndi-ozi n'aghughọ, si, Le, Geal nwa Ebed na umu-nne-ya nābà nime Shekem; ma, le, ha nākpab͕u obodo a imegide gi.
32 Ma ub͕u a, bilie n'abali, gi onwe-gi na ndi gi na ha nọ, ru kwa nbì n'ọhia:
33 ọ gēru kwa, n'ututu, mb͕e anyanwu nāwa, na i gēbili n'isi-ututu, made imegide obodo: ma, le, mb͕e ya onwe-ya na ndi ya na ha nọ nāpukute gi, i gēme kwa ha dika aka-gi gāchọta.
34 Abimelek we bilie n'abali, ya na ndi nile ndi soro ya, ha we rue nbì megide Shekem n'usu anọ.
35 Geal nwa Ebed we pua, guzo n'oghere ọnu-uzọ-ama obodo: Abimelek we si n'oruru-nbì ahu bilie, ya na ndi soro ya.