8 Osisi jere eje ite otù onye manu ka ọ buru eze-ha; ha we si osisi olive, Buru eze-ayi.
9 Osisi olive we si ha, M'gāgha manu nkem, bú nke ha ji sọpuru Chineke na madu nimem, je ifeghari n'elu osisi nile?
10 Osisi nile we si osisi fig, Gi onwe-gi bia, buru eze-ayi.
11 Osisi fig we si ha, M'gagha utọm na ezi ihe-ọmimim, je ifeghari n'elu osisi nile?
12 Osisi nile we si osisi vine, Gi onwe-gi bia, buru eze-ayi.
13 Osisi vine we si ha, M'gāgha manya ọhu nkem, bú nke nēme ka Chineke na madu ṅuria ọṅu, je ifeghari n'elu osisi nile?
14 Osisi nile we si ogwu, Gi onwe-gi bia, buru eze-ayi.