5 Ọ nēcheta ndi-ebube-ya: ha su ngọngọ n'ojije-ha, me ngwa ijeru mb͕idi obodo, ma edoziwo ihe-nkpuchi ndi nānọchigide ya n'agha.
6 Emeghewo ọnu-uzọ-ama nile nke osimiri nile, ab͕azewo ulo uku ya.
7 Ekpughewo kwa Huzab, me ka ọ rigopu, ndi-orù-ya ndinyom nākwa kwa ákwá dika olu nduru, nēti obi-ha aka.
8 Ma Nineve di ka ọdọ-miri juputara na miri site n'ubọchi nile ya onwe-ya di: ma ndi ahu nāb͕alaga; Guzonu, guzonu, ka ha nāsi; ma ọ dighi onye nāgha anya n'azu.
9 Lutanu ọla-ọcha n'agha lutanu ọla-edo n'agha: ọ dighi kwa ọgwugwu diri àkù edoziri edozi, bú ebube nke sitere n'ihe nile anāchọsi ike.
10 Ọ bu ihe tọb͕ọrọ n'efu, na ihe awusiri dika miri, na ihe ab͕abara ọtọ: obi alọwo kwa miri, isu-ngọngọ nke ikperè abua di kwa, nb͕ali di kwa n'úkwù nile, iru ha nile achagharisiwo kwa.
11 Òle ebe ebe-obibi ọdum di? ebe-ita-nri ka ọ bu-kwa-ra umu-ọdum, ebe ọdum na nne-ọdum na nwa-ọdum jeghariri, ọ dighi kwa onye nēme ka ha ma jijiji.