9 Etiopia bu ume-ya, ya na Ijipt, ọ dighi kwa ọgwugwu diri ya; Put na Lubim buri ndi-iye-aka-gi.
10 Ọbuná obodo ahu ka emere ka ọ je biri n'ala ọzọ, ọ lara na ndọta-n'agha: atupia-kwa-ra umu-ya nāṅu ara n'isi èzí nile: ọ bu kwa ndi di nsọpuru ya ka ha fekwasiri nzà, eke-kwa-ra ndi uku ya nkpọrọ.
11 Gi onwe-gi gāṅubiga kwa manya ókè, i gābu onye zoro ezo; gi onwe-gi gāchọ kwa ebe siri ike, n'ihi onye-iro.
12 Ebe-gi nile ewusiri ike gādi ka osisi fig nwere nkpuru-osisi fig buru uzọ cha: ọ buru na arùru ha arù, ha adabá n'ọnu onye nēri ha.
13 Le, ndi-gi bu ndinyom n'etiti gi; ndi-iro-gi ka emeghepusiworo ọnu-uzọ-ama nile nke ala-gi nye: ọku eripiawo ihe-ntuchi-gi nile.
14 Sere onwe-gi miri nke nnọchigide-n'agha, me ka ebe-gi nile ewusiri ike sie ike: ba n'urọ, zọta ájá, jide ihe eji akpu brick.
15 N'ebe ahu ka ọku gēripia gi; mma-agha gēbipu gi, ọ gēripia gi dika ukpala: me onwe-gi ka i rie nne dika ukpala, me onwe-gi ka i rie nne dika igurube.