7 N'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa nke-iri-na-otù, nke ahu bu ọnwa Shebat, n'arọ nke-abua nke Daraiọs, okwu Jehova we rue Zekaraia nwa Berekaia, nwa Ido, bú onye-amuma, nti, si,
8 Ahurum n'abali, ma, le otù onye nke nānọkwasi inyinya nācha uhie uhie, onye ahu nēguzo kwa n'etiti osisi myrtle nke di n'ebe miri emi; n'azu ya ka inyinya di iche iche guzoro, nke nācha uhie uhie, na nke nācha dika manu, na nke nācha ọcha.
9 M'we si, Ǹdia bu gini, onye-nwem? Mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu sirim, Mu onwem gēme ka i hu ihe ndia bu.
10 Onye ahu nke nēguzo n'etiti osisi myrtle we za, si, Ndia bu ndi Jehova ziteworo ijeghari n'uwa.
11 Ha we za mọ-ozi nke Jehova nke nēguzo n'etiti osisi myrtle, si, Ayi ejeghariwo n'uwa, ma, le, uwa nka nile nànọdu du, di jū.
12 Mọ-ozi nke Jehova we za, si, Jehova nke usu nile ndi-agha, rùe ole mb͕e ka Gi onwe-gi nāgaghi-emere Jerusalem na obodo Juda nile ebere, bú nke I wesaworo oké iwe ọgu arọ atọ na iri ndia?
13 Jehova we za mọ-ozi nke nāgwam okwu okwu ọma di iche iche, bú okwu nkasi-obi.