Zekaraia 14 IGBOB

1 Le, otù ubọchi nābiara Jehova, mb͕e agēkesa ihe-nkwata-gi n'etiti gi.

2 M'gāchikọta kwa mba nile ibuso Jerusalem agha; agēwere kwa obodo a, punara ya ulo-ya nile, merua ndinyom-ya: nkera obodo a gāpu buru ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ma agaghi-ebipu ndi nka fọduru n'obodo a.

3 Jehova gāpu kwa, buso mba ahu nile agha, dika n'ubọchi O buru agha n'ubọchi ilu-ọ̀gù.

4 Ukwu-Ya abua gēguzo kwa n'ubọchi ahu n'elu ugwu Olive, nke di n'iru Jerusalem n'Iru-anyanwu, ugwu Olive gāb͕awa kwa n'etiti abua ya n'akuku Ọwuwa-anyanwu na n'akuku Ọdida-anyanwu, oké ndagwurugwu di uku ewe di; nkera ugwu ahu gāpuzuga n'akuku Ugwu, nkera-ya n'akuku Ndida.

5 Unu gēsi kwa na ndagwurugwu ugwum nile b͕alaga; n'ihi na ndagwurugwu ugwu ahu gēru Eze: e, unu gāb͕alaga, dika unu siri n'iru ala-ọma-jijiji b͕alaga n'ubọchi Uzaia, bú eze Juda: Jehova, bú Chinekem, gābia kwa, ndi nsọ nile gēsoro Gi.

6 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na ìhè agaghi-adi, ìhè nēnwu enwu gāb͕achi:

7 ma ọ gābu otù ubọchi nke Jehova mara: ọ bughi ehihie, ọ bughi kwa abali: ma o gēru, na ìhè gādi na mb͕e anyasi.

8 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na miri nēnye ndu gēsi na Jerusalem rùputa; nkera-ha gērùga n'oké osimiri Iru-anyanwu, nkera-ha gērùga kwa n'oké osimiri Ọdida-anyanwu: na mb͕e okpom-ọku na na mb͕e oyi ka ọ gadi.

9 Jehova gāghọ kwa eze elu-uwa nile: n'ubọchi ahu ka Jehova gādi otù, aha-Ya gādi kwa otù.

10 Ala nka nile gāghọ ihe di ka Araba, site na Geba rue Rimon na Ndida Jerusalem: agēbuli kwa ya elu, ọ gēbi kwa n'ọnọdu-ya, site n'ọnu-uzọ-ama Benjamim rue ebe ọnu-uzọ-ama mbu, rue ọnu-uzọ-ama nke nkuku, site kwa n'ulo-elu Hananel rue ebe-nzọcha-nkpuru-vine nile nke eze.

11 Agēbi kwa nime ya, nwezuga ka ebibie ya agaghi-adi kwa ọzọ; Jerusalem gēbi kwa na ntukwasi-obi.

12 Nka gābu kwa ihe-otiti nke Jehova gēji ti ndi nile di iche iche ndi busoworo Jerusalem agha: anu-aru-ha nile n'otù n'otù gātasi ata mb͕e ha onwe-ha nēguzo n'ukwu-ha, anya-ha gātasi kwa ata n'oghere-ha, ire-ha gātasi kwa ata n'ọnu-ha.

13 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na oké ọb͕ub͕a-aghara nke Jehova gādi n'etiti ha; ha gējide kwa, onye ọ bula o jide ibe-ya aka, aka-ya gēbili kwa imegide aka madu-ibe-ya.

14 Ọzọ, Juda gēbuso kwa Jerusalem agha; agēkpokọta kwa àkù mba nile di buruburu, bú ọla-edo na ọla-ọcha na uwe bara uba nke-uku.

15 Otú a ka ihe-otiti nke inyinya na inyinya mule na camel na inyinya-ibu na anumanu ọ bula nke gādi n'ulo-ikwū ndia gādi, dika ihe-otiti a.

16 Ọ gēru kwa, na onye ọ bula nke fọduru n'etiti mba nile ndi nābia imegide Jerusalem gārigo kwa-arọ ikpọ isi ala nye Eze, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, na ime ememe ulo-ntu.

17 Ọ gēru kwa, na ab͕uru ọ bula n'etiti ab͕uru nile nke uwa nke nādighi-arigota na Jerusalem ikpọ isi ala nye Eze, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, miri agaghi-ezokwasi ha.

18 Ọ buru kwa na ab͕uru Ijipt adighi-arigobata, ọ̀ gaghi-adi n'aru ha, bú ihe-otiti, nke Jehova gēji ti mba nile ndi nādighi-arigo ime ememe ulo-ntu?

19 Nka gābu ahuhu-nmehie nke Ijipt, na ahuhu-nmehie nke mba nile ndi nādighi-arigo ime ememe ulo-ntu.

20 N'ubọchi ahu ka IHE NSỌ JEHOVA NWERE gādi n'elu ataṅu nile nke inyinya; ite nile n'ulo Jehova gādi kwa ka ọkwa-nwusa di n'iru ebe-ichu-àjà.

21 E, ite ọ bula nke di na Jerusalem, ma-ọbu nke di na Juda, gābu ihe nsọ Jehova nke usu nile nke ndi-agha nwere: ndi nile ndi nāchu àjà gābia kwa chiri ufọdu nime ha, sie ihe nime ha: ọ dighi kwa onye Kenean gādi ọzọ n'ulo Jehova nke usu nile nke ndi-agha n'ubọchi ahu.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14