1 M'we welie anyam abua ọzọ, hu, ma le, akwukwọ-npiakọta nke nēfe efe.
2 O we sim, Gini ka gi onwe-gi nāhu? M'we za, Mu onwem nāhu akwukwọ-npiakọta nēfe efe; ogologo-ya di orú cubit, obosara-ya di kwa cubit iri.
3 O we sim, Nka bu ọb͕ub͕a-iyi nke nāpùru iru ala nka nile: n'ihi na onye ọ bula nke nēzu ori ka agēkpochapu n'ebe a dika o si di; ọ bu kwa onye ọ bula nke nāṅu iyi ka agēkpochapu n'ebe a dika o si di.
4 Emewom ka ọ puta, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), ọ gābà kwa n'ulo onye-ori na n'ulo onye ji aham aṅu iyi ugha: ọ gānọ kwa ọnọdu-abali n'etiti ulo-ya, me ka ọ gwusia, ya na osisi-ya na nkume-ya nile.