1 M'we welie anyam abua ọzọ, hu, ma le, ub͕ọ-ala anọ nēsi n'etiti ugwu abua puta; ugwu ahu bu ugwu ọla.
2 N'ub͕ọ-ala mbu ka inyinya nācha uhie uhie di; n'ub͕ọ-ala nke-abua ka inyinya nēji nji di;
3 n'ub͕ọ-ala nke-atọ ka inyinya nācha ọcha di; n'ub͕ọ-ala nke-anọ ka inyinya turu agwa nwe-kwa-ra ume di.
4 M'we za, si mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu, Gini bu ndia, onye-nwem?
5 Mọ-ozi ahu we za, sim, Ndia bu ifufe anọ nke elu-igwe, ndi nēsi n'iguzo onwe-ha n'iru Onye-nwe uwa nka nile pua.
6 Ub͕ọ-ala ahu nke inyinya nēji nji di nime ya nāpuru ala Ugwu; nke nācha ọcha puso-kwa-ra ha; nke turu agwa puru-kwa-ra ala Ndida.
7 Inyinya nwere ume pu-kwa-ra, chọ ije ka ha we jegharia n'uwa: o we si, J nu, jegharia n'uwa. Ha we jegharia n'uwa.