9 Onye ọ bula nke amuworo site na Chineke adighi-eme nmehie, n'ihi na nkpuru-Ya nādigide nime ya: ọ pughi kwa imehie, n'ihi na amuwo ya site na Chineke.
10 Nime nka ka umu Chineke bu ndi emeworo ka ha puta ìhè, ha na umu ekwensu: onye ọ bula nke nādighi-eme ezi omume esighi na Chineke puta, onye nke nādighi-ahu nwa-nna-ya n'anya esighi kwa na Ya puta.
11 N'ihi na nka bu ozi ahu unu nuru site na mbu, ka ayi hurita onwe-ayi n'anya:
12 ọ bughi dika Ken si buru onye si n'ajọ onye ahu puta, we b͕ue nwa-nne-ya. Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka o b͕uru ya? N'ihi na ọlu-ya jọrọ njọ, ma ọlu nke nwa-nne-ya ziri ezi.
13 Umu-nnam, ka ọ ghara iju unu anya ma ọ buru na uwa akpọ unu asì.
14 Ayi onwe-ayi matara na ayi esitewo n'ọnwu ba na ndu, n'ihi na ayi nāhu umu-nna-ayi n'anya. Onye nādighi-ahu n'anya nānọgide n'ọnwu.
15 Onye ọ bula nke nākpọ nwa-nna-ya asì bu ob͕u-madu: unu mata-kwa-ra na ọ dighi ob͕u-madu ọ bula nwere ndu ebighi-ebi nādigide nime ya.