1 N'ihi na unu onwe-unu matara, umu-nna-ayi, nbata ayi batara n'ebe unu nọ, na ahuwo na ọ bughi ihe-efu:
2 kama ọ bu ezie na ayi hururi ahuhu na mbu, eme kwa ayi ihe-ihere, dika unu matara, na Filipai, ma ayi kwuwara okwu nime Chineke-ayi igwa unu ozi ọma Chineke n'oké nb͕a.
3 N'ihi na aririọ ayi nāriọ unu esighi na njehie puta, o sighi kwa n'adighi-ọcha, ọ bughi kwa n'aghughọ:
4 kama dika Chineke nwaputaworo ayi ka enye ozi ọma Ya n'aka-ayi na ntukwasi-obi idebe, otú a ka ayi nēkwu; ọ bughi dika ndi nēme ihe gātọ madu utọ, kama dika ndi nēme ihe gātọ Chineke utọ, bú Onye nānwa obi-ayi.
5 N'ihi na ọ dighi mb͕e ọ bula ahuru ayi n'ikwu okwu nrafu, dika unu matara, ma-ọbu n'iwere aghughọ b͕achita anya-uku, Chineke bu onye-àmà;
6 ma-ọbu n'ichọ otuto site na madu, ma-ọbu n'aka-unu, ma-ọbu n'aka ndi ọzọ, mb͕e ayi puru idi ka ibu arọ́, dika ndi-ozi Kraist.