3 ọ buru na unu deturu n'ire na Onye-nwe-ayi bu onye nwere obi-ọma;
4 Onye unu nābiakute, bú nkume di ndu, Nke madu juru n'ezie, ma n'ebe Chineke nọ Ọ bu ihe arọputara, buru kwa ihe anāsọpuru,
5 ewe were kwa unu onwe-unu, dika nkume di ndu, wu, ka unu buru ulo nke Mọ Nsọ, ka unu we buru òtù ndi-nchu-àjà di nsọ, ichu àjà nke di ka Mọ Nsọ si cho, nke di Chineke ezi nma site na Jisus Kraist.
6 N'ihi na ekwuru n'ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, si,Le, anamatọb͕ọ na Zaion otù isi nkume nime nkuku ntọ-ala, nke bu ihe arọputara, buru kwa ihe anāsọpuru:Onye kwe-kwa-ra na Ya, agaghi-eme ka ihere me ya ma-ọli.
7 Ya mere ọ bu unu, bú ndi kwere ekwe, ka nsọpuru ahu diri: ma n'ebe ndi nādighi-ekwe nọ,Nkume nke ndi nēwu ulo juru,Nke ahu ka emere isi nkuku ulo;
8 na,Nkume isu-ngọngọ, na oké nkume nke ima-n'ọnyà;n'ihi na ha nāsu ngọngọ n'okwu ahu, ebe ha nēkweyeghi ekweye: edo-kwa-ra ha ka ha me ihe a.
9 Ma unu onwe-unu bu ọb͕ọ ndi arọputaworo, òtù ndi-nchu-àjà ndi bu kwa eze, mba di nsọ, ndi nke Chineke nwetara, ka unu we kwusa idi-nma nile nke Onye ahu Onye kpọputara unu n'ọchichiri ahu ba n'ìhè-Ya di ebube: