7 ma ju akukọ-irò nile emeruru emeru nke di-kwa-ra agadi-ndinyom. Ma nānwa onwe-gi ka i we rue nsọpuru-Chineke:
8 n'ihi na ọnwunwa nke aru bara urù nye ihe ntà; ma nsọpuru-Chineke bara urù nye ihe nile, ebe o nwere nkwa nke ndu, ma nke ndu ub͕u a, ma nke gaje ibia.
9 Okwu a kwesiri ntukwasi-obi, kwesi kwa ka anara ya nke-ọma n'uzọ nile ọ bula.
10 N'ihi na ọ bu iru nka ka ayi nādọb͕u onwe-ayi n'ọlu, nāb͕asi kwa nb͕a ike, n'ihi na ayi elewo anya Chineke di ndu, Onye bu Onye-nzọputa madu nile, ma nke kachasinu Onye nzọputa nke ndi kwere ekwe.
11 Nēnye ihe ndia n'iwu, nēzí kwa ha.
12 Ekwela ka onye ọ bula lelìa nwata i bu anya; kama me onwe-gi ka i buru ndi kwere ekwe ihe-atù, n'okwu, n'ibi-obi, n'ihu-n'anya, n'okwukwe, n'idi-ọcha.
13 Rue mb͕e m'gābia, nāṅa nti ọgugu-akwukwọ-gi na idu-ọdu-gi na ozizí-gi.