24 Ub͕ò ise ka ndi-Ju piaram otù adighi n'ọgu ube-utari abua.
25 Ub͕ò atọ ka apiaram utari, otù ub͕ò ka aturum nkume, ub͕ò atọ ka ub͕ọ m'nọ nime ya kpùru, otù ubọchi abali na ehihie ka m'nọworo nime ob͕u-miri;
26 n'ije ọtutu mb͕e, n'ize-ndu site n'osimiri, n'ize-ndu site na ndi nāpunara madu ihe, n'ize-ndu site na ndi mba nkem, n'ize-ndu site na ndi mba ọzọ, n'ize-ndu nime obodo, n'ize-ndu nime ọhia, n'ize-ndu nime oké osimiri, n'ize-ndu n'etiti umu-nna ugha;
27 n'idọb͕u onwem n'ọlu na ihuju-anya, n'imu-anya ọtutu mb͕e, n'oké agu na akpiri-ikpọ-nku, n'obubu-ọnu ọtutu mb͕e, n'oyi na ib͕a-ọtọ.
28 Nāgughi ihe di n'èzí, ihe ahu di nke nānyib͕um kwa-ubọchi, bú ncheb͕u m'nēcheb͕u onwem bayere nzukọ Kraist nile.
29 Ònye nādighi ike, nke mu onwem nēsoghi ya n'adighi-ike? ònye ka anēme ka ọ ma n'ọnyà, nke mu onwem nēreghi ọku n'ihi ya?
30 Ọ buru na aghaghi m inya isi, m'gānya isi n'ihe nke diri adighi-ikem.