3 Amata-kwa-ram madu di otú a (ma ọ bu nime aru, ma-ọbu na aru anọghi ya, amataghi m; Chineke matara),
4 na eweliri ya rigo na Paradais na mberede, o we nu okwu nke anāpughi ikwu, nke o nēzighi ezi n'iwu ka madu kwue ha.
5 M'ganānya isi bayere onye di otú a: ma m'gaghi-anya isi bayere mu onwem, ma-ọbughi n'adighi-ikem nile.
6 N'ihi na asi na agamachọ inya isi, m'gaghi-abu onye nēnweghi uche; n'ihi na m'gēkwu ezi-okwu: ma esepurum aka, ka onye ọ bula we ghara igu ihe bayerem kari ihe ọ huru na abum, ma-ọbu nke ọ nuru n'ọnum.
7 N'ihi ọkika nke nkpughe ndia-n'ihi ya, ka ewe ghara iwelibigam ókè, enyerem ogwu n'anu-arum, bú mọ-ozi nke Setan, ka o we tiem aka, ka ewe ghara iwelibigam ókè.
8 Ub͕ò atọ ka m'riọrọ Onye-nwe-ayi aririọ bayere ihe a, ka ọ pua n'arum.
9 Ọ siwokwam, Amaram ezuworo gi: n'ihi na emewo ka ikem zu oké n'adighi-ike. Ya mere kama ihe ọzọ m'gēwere obi-utọ nile nya isi n'adighi-ikem nile, ka ike nke Kraist we ridakwasim, biri kwa nimem.