13 mọm adighi nfé ma-ọli, n'ihi na ahughi m Taitọs nwa-nnam: kama ekelerem ha ekele ikpe-azu, we pua je Masedọnia.
14 Ma ekele diri Chineke, Onye nēdughari ayi n'ọṅù-agha nime Kraist mb͕e nile, nēsite kwa n'aka-ayi egosi isìsì nke ọmuma-Ya n'ebe nile.
15 N'ihi na ayi bu isìsì utọ nke Kraist n'ebe Chineke nọ, n'etiti ndi anāzọputa, na n'etiti ndi nāla n'iyì;
16 n'ebe ndia nọ ọ bu isìsì nke sitere n'ọnwu we dubà n'ọnwu; n'ebe ndi ahu anāzọputa nọ ọ bu isìsì nke sitere na ndu we dubà na ndu. Ma ònye ruru ime ihe ndia?
17 N'ihi na ayi adighi ka ọra madu, ndi were ihe nādighi nma nētigwa n'okwu Chineke: kama dika ndi sitere n'idi-ọcha, kama dika ndi sitere na Chineke, ọ bu n'iru Chineke, nime Kraist ka ayi nēkwu.