9 dika ndi anāmaghi aha-ha, ma amazuru ayi; dika ndi nānwu anwu, ma le, ayi di ndu; dika ndi anēme ka ha muta ihe site n'ahuhu, ma adighi-eme ka ayi nwua;
10 dika ndi ihe nēwuta, ma ayi nāṅuri ọṅu mb͕e nile; dika ndi-ob͕eye, ma ayi nēme ka ọtutu madu buru ọgaranya; dika ndi nēnweghi ihe, ma ayi nēnwezu ihe nile.
11 Ndi Kọrint, ọnu-ayi ghere oghe igwawa unu okwu, emewo ka obi-ayi di obodobo.
12 Adighi-eme ka unu nọ n'ọnọdu di oké nkpà nime ayi, ma anēme ka unu nọ n'ọnọdu di oké nkpà n'obi nke unu.
13 Ma dika ugwọ-ọlu n'otù uzọ ahu (anamekwu dika anāgwa umum), ka eme kwa ka unu onwe-unu di obodobo n'obi-unu.
14 Unu na ndi nēkweghi ekwe ekekọtala onwe-unu, n'ihi na unu na ha di iche: n'ihi na òle nkekọ ezi omume na imebi-iwu nēkekọ? ma-ọbu òle nnwekọ ìhè na ọchichiri nēnwekọ?
15 Ọzọ, òle nnwekọ-otù-olu Kraist na Belial nēnwekọ? ma-ọbu òle òkè onye kwere ekwe na onye nēkweghi ekwe nēkerita?