1 Nke fọduru, umu-nna-ayi, nēkpenu ekpere bayere ayi, ka okwu Onye-nwe-ayi we b͕a ọsọ, ka ewe nye kwa ya otuto, otú ọ di kwa n'etiti unu;
2 ka ewe dọputa kwa ayi n'aka ajọ madu ndi nēmehie kwa; n'ihi na ọ bughi madu nile nwere okwukwe.
3 Ma Onye-nwe-ayi bu onye kwesiri ntukwasi-obi, Onye gēme ka unu guzosie ike, che kwa unu ka unu ghara idabà n'aka ajọ onye ahu.
4 Ma ayi atukwasiwo obi n'aru unu nime Onye-nwe-ayi, na unu nēme, gēme kwa, ihe nile ayi nēme n'iwu.