1 Ma ayi nāriọ unu, umu-nna-ayi, n'ihi ọbibia nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na nzukọ ayi gēzukọ n'ebe Ọ nọ;
2 ka ewe ghara isite n'aka mọ, ma-ọbu okwu, ma ọbu akwukwọ-ozi di ka o sitere n'aka-ayi, me ka unu me nkpatu pua n'uche-unu ọsọsọ, ma-ọbu ka unu tua ujọ, dika agāsi na ubọchi Onye-nwe-ayi di ub͕u a:
3 unu ekwela ka onye ọ bula ghọb͕ue unu n'uzọ ọ bula: n'ihi na ọ gaghi-adi, ma ọ buru na nwezuga ahu ebughi uzọ bia, ewe kpughe onye ahu nēmebi iwu, bú nwa nke ila-n'iyì,
4 onye nēmegide nēweli kwa onwe-ya elu imegide ihe nile anākpọ Chineke ma-ọbu nke bu ihe anāsọpuru dika Chineke; ya mere ọ nānọdu n'ulo nsọ nke Chineke, nēgosi onwe-ya si na ya bu Chineke.
5 Ùnu echetaghi, na, mb͕e m'nānọ n'etiti unu n'oge gara aga, ọ bu ihe ndia ka m'nāgwa unu?
6 Ub͕u a unu matakwara ihe nēb͕ochi, ka ewe kpughe ya n'oge nke aka ya.
7 N'ihi na ihe-omimi nke nmebi-iwu nālusi ọlu ike ub͕u a: nání rue mb͕e agēwepu onye ahu n'etiti, bú onye nēb͕ochi ub͕u a.
8 Mb͕e ahu ka agēkpughe kwa onye ahu nēmebi iwu, onye Onye-nwe-ayi Jisus gēwere iku-ume nke si n'ọnu-Ya puta b͕ue, were kwa ngosi nke ọbibia-Ya me ka ọ ghara idi irè;
9 bú onye ahu, nke ọbibia-ya di ka ilusi-ọlu-ike nke Setan n'ike nile ọ bula na ihe-iriba-ama di iche iche na ọlu-ebube di iche iche nke ugha,
10 n'aghughọ nile kwa nke ajọ omume n'ebe ndi nāla n'iyì nọ; n'ihi na ha anaraghi ihu-n'anya nke ezi-okwu nke-ọma, ka ewe zọputa ha.
11 N'ihi nka Chineke nēzitekwara ha ilusi-ọlu-ike nke njehie, ka ha kwere ugha ahu:
12 ka ewe kpe ha nile ikpé, bú ndi nēkweghi ezi-okwu, kama ajọ omume diri ha ezi nma.
13 Ma ayi onwe-ayi ji ugwọ ikele Chineke ekele mb͕e nile bayere unu, umu-nna-ayi ndi Onye-nwe-ayi huru n'anya, n'ihi na Chineke rọputara unu site na mbu ka unu we nwe nzọputa nime ido-nsọ nke Mọ Nsọ nēdo na ikwere ezi-okwu:
14 nke O sitere n'aka ozi ọma ayi kpọbata unu nime ya, ka unu we nweta ebube nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.
15 Ya mere otú a, umu-nna-ayi, nēguzosinu ike, jidekwanu ozizí nile enyere n'aka idebe nke ezíri unu, ma-ọbu site n'okwu-ọnu-ayi, ma-ọbu site n'akwukwọ-ozi-ayi.
16 Ma ka Ya onwe-ya, bú Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na Chineke, bú Nna-ayi, Onye huru ayi n'anya nye kwa ayi nkasi-obi ebighi-ebi na ezi olile-anya nime amara,
17 ka Ọ kasie obi-unu, me kwa ka ha guzosie ike n'ezi ọlu na ezi okwu nile ọ bula.