15 Unu agukwala ya n'onye-iro, kama nādunu ya ọdú dika nwa-nna.
16 Ma Ya onwe-ya, bú Onye-nwe udo, Ya nye unu udo mb͕e nile n'uzọ nile. Ka Onye-nwe-ayi nọyere unu.
17 Ekele nke mu Pọl nke m'ji aka nkem de, nke bu ihe-iriba-ama n'akwukwọ-ozi nile ọ bula: otú a ka m'nēde.
18 Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist dinyere unu nile.