4 nāsi kwa, Òle ebe nkwa nke ọbibia-Ya di? n'ihi na site n'ubọchi nna-ayi-hà dara n'ura ọnwu, ihe nile nādigide dika ha diworo site na nmalite nke òkìkè.
5 N'ihi na nka mere ha nchefu n'ihi na ha nāchọ ya, na elu-igwe di site na mb͕e ochie, ha na ala nke esitere na miri were kwa miri me ka o guzokọ n'otù, site n'okwu Chineke;
6 nke esitere n'aka-ha me ka uwa nke di n'oge ahu la n'iyì, n'ihi na iju-miri rikpuru ya:
7 ma elu-igwe nke di ub͕u a, ha na uwa, ka akpadoworo nye ọku site n'otù okwu ahu, ebe anēdebe ha nye ubọchi nke ikpé na ila-n'iyì nke ndi nādighi-asọpuru Chineke.
8 Ma unu ekwela ka otù ihe a me unu nchefu, ndi m'huru n'anya, na otù ubọchi di ka nnù arọ abua na ọgu iri n'anya Onye-nwe-ayi, nnù arọ abua na ọgu iri di kwa ka otù ubọchi.
9 Onye-nwe-ayi anọghi ọdù n'ime nkwa-Ya, dika ufọdu nāgu ya na ọ bu inọ-ọdù; kama Ọ nātachiri unu ogologo-ntachi-obi, n'ihi na O zubeghi ka ndi ọ bula la n'iyì, kama ka madu nile bia rue nchèghari.
10 Ma ubọchi Onye-nwe-ayi gābia dika onye-ori; nke ọ bu nime ya ka elu-igwe gēji oké ùzù gabiga, ihe nile di n'elu-igwe gāb͕a kwa ọku we la n'iyì, uwa na ọlu nile aluru nime ya gērechapu kwa.