7 N'ihi na Chineke enyeghi ayi mọ nke ujọ; kama ọ bu nke ike na ihunanya na ime ka uche zuo okè.
8 Ya mere ka ihere àmà nke Onye-nwe-ayi, ma-ọbu ihere nke mu onye-nkpọrọ-Ya, ghara ime gi: kama so ozi ọma Ya hujukọ anya dika ike nke Chineke si di;
9 Onye zọputara ayi, were kwa ọkpukpọ di nsọ kpọ ayi, ọ bughi dika ọlu-ayi si di, kama dika ihe Ya onwe-ya zubere, na amara-Ya, si di, nke enyere ayi nime Kraist Jisus mb͕e oge ebighi-ebi akērughi,
10 ma emere ka ọ puta ìhè ub͕u a site na ngosi nke Onye-nzọputa-ayi Kraist Jisus, Onye mere ka ọnwu ghara idi ìrè, site kwa n'ozi ọma Ya weputa ndu na emebighi-emebi n'ìhè,
11 bú ozi ọma nke edoro mu onwem ka m'buru onye-nkwusa, na onye-ozi, na onye-ozizí, izisa ya.
12 Ọ bu kwa n'ihi ihe a ka m'nāhu kwa ahuhu ndia: ma ihere adighi-emem; n'ihi na amataram Onye m'kweworo okwu-Ya, eme-kwa-ra ka m'kweye na Ọ puru iche ihe m'nyere n'aka-Ya idebe nche rue ubọchi ahu.
13 Jide ihe ilere anya nke okwu nēnye ezi ndu nke i nuru n'ọnum, nime okwukwe na ihunanya nke di nime Kraist Jisus.