1 Anamagwasi gi ike n'iru Chineke na Kraist Jisus, Onye gaje ikpe ndi di ndu na ndi nwuru anwu ikpé, ewerekwam ngosi-Ya na ala-eze-Ya si gi;
2 kwusa okwu-Ya; tukwasi uche n'ọlu-gi n'oge kwesiri, ma-ọbu n'oge nēkwesighi; tu madu nmehie-ha n'anya, ba nba, riọ aririọ, n'ogologo-ntachi-obi nile na ozizí nile.
3 N'ihi na oge gādi mb͕e ha agaghi-anagide ozizí ahu nke nēnye ezi ndu; kama, ebe ha nwere nti nākọ ọkọ, ha gēkpokwasi ndi-ozizí nye onwe-ha dika agu ihe ọjọ nke aka ha si di;
4 ha gēchighari kwa nti-ha ka ha ghara inu ezi-okwu, ma ha gējehie ṅa nti akukọ-irò.
5 Ma gi onwe-gi, nēnwe anya-udo n'ihe nile, huju anya, lua ọlu nke onye nēzisa ozi ọma, jezu ozi-gi.