2 nēdega-kwa-ra Apfia nwa-nna-ayi nwanyi, na Akipọs onye ayi na ya nēbukọ agha, na nzukọ Kraist di n'ulo-gi:
3 Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta.
4 Anamekele Chinekem mb͕e nile mb͕e m'necheta gi n'ekperem nile,
5 ebe m'nānu okwu bayere ihu-n'anya-gi na okwukwe-gi, bú okwukwe i kwere n'Onye-nwe-ayi Jisus, na ihu-n'anya i huru ndi nsọ nile;
6 ekpere m'nēkpe bu ka nnwekọ nke okwukwe-gi we ghọ ihe nālusi ọlu ike, nime nmazu nke ezi ihe nile ọ bula nke di nime ayi, rue na Kraist.
7 N'ihi na enwerem ọtutu ọṅù na nkasi-obi n'ihi ihu-n'anya-gi, n'ihi na obi ndi nsọ ezuwo ike site n'aka-gi, nwa-nnam.
8 N'ihi nka, ọ bu ezie na enwerem oké nkwuwa-okwu nime Kraist iwere ihe nke kwesiri nye gi n'iwu,