Failimon 1 IGBOB

1 Pọl, onye-nkpọrọ nke Kraist Jisus, na Timọti nwa-nna-ayi nēdegara Failimon akwukwọ, bú onye ayi huru n'anya, onye ayi na ya nālukọ kwa ọlu,

2 nēdega-kwa-ra Apfia nwa-nna-ayi nwanyi, na Akipọs onye ayi na ya nēbukọ agha, na nzukọ Kraist di n'ulo-gi:

3 Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta.

4 Anamekele Chinekem mb͕e nile mb͕e m'necheta gi n'ekperem nile,

5 ebe m'nānu okwu bayere ihu-n'anya-gi na okwukwe-gi, bú okwukwe i kwere n'Onye-nwe-ayi Jisus, na ihu-n'anya i huru ndi nsọ nile;

6 ekpere m'nēkpe bu ka nnwekọ nke okwukwe-gi we ghọ ihe nālusi ọlu ike, nime nmazu nke ezi ihe nile ọ bula nke di nime ayi, rue na Kraist.

7 N'ihi na enwerem ọtutu ọṅù na nkasi-obi n'ihi ihu-n'anya-gi, n'ihi na obi ndi nsọ ezuwo ike site n'aka-gi, nwa-nnam.

8 N'ihi nka, ọ bu ezie na enwerem oké nkwuwa-okwu nime Kraist iwere ihe nke kwesiri nye gi n'iwu,

9 ma n'ihi ihu-n'anya ahu ọ kam nma iriọ aririọ, ebe m'bu nání aha madu dika Pọl, bú agadi, buru kwa onye-nkpọrọ nke Kraist Jisus ub͕u a:

10 ariọm gi aririọ bayere nwa nkem, onye m'muru nime ab͕um, bú Ọnisimọs,

11 onye buri onye nābaghi n'ihe n'ebe i nọ n'oge gara aga, ma ub͕u a ọ bara gi n'ihe, ba-kwa-ram n'ihe:

12 onye m'nēzighachiri gi, ya onye-ya, nke ahu bu, obi nkem:

13 onye mu onwem nēzuberi ijide ka mu na ya nọdu, ka o we nējerem ozi n'ab͕u nke ozi ọma n'ọnọdu gi:

14 ma achọghm ime ihe ọ bula mb͕e i kēkweyeghi; ka idi-nma-gi we ghara idi ka agāsi na ọ di n'uzọ nkpà, kama ka o we di n'uzọ ọchichọ-obi-gi.

15 N'ihi na eleghi anya ọ bu n'ihi nka ka ekewapuru ya n'ebe i nọ nwa oge ntà, ka i we nwe ya ebighi-ebi;

16 ọ dighi kwa ka orù ọzọ, kama ọ kariri orù, ọ di ka nwa-nna ahuru n'anya, nke kachasinu n'ebe m'nọ, ma nke kariri nke ahu nke-uku n'ebe i nọ, nime anu-aru na nime Onye-nwe-ayi kwa.

17 Ya mere ọ buru na i gurum n'onye-nnwekọ, nara ya nke-ọma dika mu onwem.

18 Ma ọ buru na o mejọrọ gi n'uzọ ọ bula, ma-ọbu na o ji gi ugwọ ọ bula, gua ya n'ugwọ m'ji gi;

19 Mu onwem, bú Pọl, were aka nkem de ya n'akwukwọ a, mu onwem gākwughachi ya: ka m'ghara igwa gi na ọ bu kwa onwe-gi ka i jim n'ugwọ tukwasi ihe ọzọ.

20 E, nwa-nnam, kwe ka mu onwem nwe obi-utọ n'aru gi nime Onye-nwe-ayi: me ka obim zuru ike nime Kraist.

21 Ebe m'tukwasiworo obi n'iṅa-nti-gi anamedegara gi akwukwọ, n'ihi na amataram na i gēme ọbuná kari ihe m'nēkwu.

22 Ma ọzọ kwa, dozi-kwa-ram ebe m'gānọ dika ọbìa: n'ihi na anamele anya na agēwerem nye unu n'amara site n'ekpere-unu.

23 Epafras, onye adọkọro mu na ya n'agha nime Kraist Jisus, nēkele gi;

24 ọ bu kwa otú a Mak na Aristakọs na Dimas na Luk, bú ndi mu na ha nālukọ ọlu, nēkele unu.

25 Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere mọ-unu. Amen.

isiakwụkwọ

1