5 ebe m'nānu okwu bayere ihu-n'anya-gi na okwukwe-gi, bú okwukwe i kwere n'Onye-nwe-ayi Jisus, na ihu-n'anya i huru ndi nsọ nile;
6 ekpere m'nēkpe bu ka nnwekọ nke okwukwe-gi we ghọ ihe nālusi ọlu ike, nime nmazu nke ezi ihe nile ọ bula nke di nime ayi, rue na Kraist.
7 N'ihi na enwerem ọtutu ọṅù na nkasi-obi n'ihi ihu-n'anya-gi, n'ihi na obi ndi nsọ ezuwo ike site n'aka-gi, nwa-nnam.
8 N'ihi nka, ọ bu ezie na enwerem oké nkwuwa-okwu nime Kraist iwere ihe nke kwesiri nye gi n'iwu,
9 ma n'ihi ihu-n'anya ahu ọ kam nma iriọ aririọ, ebe m'bu nání aha madu dika Pọl, bú agadi, buru kwa onye-nkpọrọ nke Kraist Jisus ub͕u a:
10 ariọm gi aririọ bayere nwa nkem, onye m'muru nime ab͕um, bú Ọnisimọs,
11 onye buri onye nābaghi n'ihe n'ebe i nọ n'oge gara aga, ma ub͕u a ọ bara gi n'ihe, ba-kwa-ram n'ihe: