35 Ya mere Jisus siri ha, Nwa oge fọduru ka Ìhè ahu gādi n'etiti unu. Nējegharinu mb͕e unu nēnwe Ìhè ahu, ka ọchichiri ghara ijide unu: onye nējeghari n'ọchichiri adighi-amata ebe ọ nēje.
36 Mb͕e unu nēnwe Ìhè ahu, kwerenu n'Ìhè ahu, ka unu we ghọ umu Ìhè.Ihe ndia ka Jisus kwuru, O we je zonari ha Onwe-ya.
37 Ma ọ bu ezie na O mereri ọtutu ihe-iriba-ama di otú a n'iru ha, ma ha ekweghi na Ya:
38 ka okwu Aisaia onye-amuma we mezu, nke o kwuru, si,Onye-nwe-ayi, ònye kwere ihe ayi nuworo?Ogwe-aka Onye-nwe-ayi kwa, n'àru onye ka ekpugheworo ya?
39 N'ihi nka ha apughi ikwere, n'ihi na Aisaia siri ọzọ,
40 O mewo ka anya-ha kpue ìsì, O me-kwa-ra ka obi-ha me etili;Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ, ghara kwa iwere obi-ha ghọta,Ghara kwa ichighari,Ka M'ghara kwa ime ka aru di ha ike.
41 Ihe ndia ka Aisaia kwuru, n'ihi na ọ huru ebube-Ya; o kwu-kwa-ra okwu bayere Ya.