37 Ma ọ bu ezie na O mereri ọtutu ihe-iriba-ama di otú a n'iru ha, ma ha ekweghi na Ya:
38 ka okwu Aisaia onye-amuma we mezu, nke o kwuru, si,Onye-nwe-ayi, ònye kwere ihe ayi nuworo?Ogwe-aka Onye-nwe-ayi kwa, n'àru onye ka ekpugheworo ya?
39 N'ihi nka ha apughi ikwere, n'ihi na Aisaia siri ọzọ,
40 O mewo ka anya-ha kpue ìsì, O me-kwa-ra ka obi-ha me etili;Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ, ghara kwa iwere obi-ha ghọta,Ghara kwa ichighari,Ka M'ghara kwa ime ka aru di ha ike.
41 Ihe ndia ka Aisaia kwuru, n'ihi na ọ huru ebube-Ya; o kwu-kwa-ra okwu bayere Ya.
42 Otú ọ di, ọbuná site n'etiti ndi-isi ọtutu kwere na Ya; ma n'ihi ndi-Farisi ha ekwuputaghi ya, ka aghara ichupu ha n'ulo-nzukọ:
43 n'ihi na ha huru otuto madu n'anya kari otuto Chineke.