12 Mb͕e Mu na ha nọri, Mu onwem nēdebe ha n'aha-Gi nke I nyeworom: eche-kwa-ram ha, ọ dighi kwa onye ọ bula nime ha lara n'iyì, ma-ọbughi nwa nke ila-n'iyì ahu; ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ we mezu.
13 Ma anamabiakute Gi ub͕u a; okwu ndia ka M'nēkwu kwa nuwa, ka ha we nwe ọṅùm ka o zuworo nime onwe-ha.
14 Mu onwem enyewo ha okwu-Gi; uwa kpọ-kwa-ra ha asì, n'ihi na ha esiteghi n'uwa, dika Mu onwem nēsiteghi n'uwa.
15 Ekpeghm ekpere ka I wepu ha n'uwa, kama ka I debe ha ka ha pua n'aka ajọ onye ahu.
16 Ha esiteghi n'uwa, dika Mu onwem nēsiteghi n'uwa.
17 Were ezi-okwu do ha nsọ: okwu-Gi bu ezi-okwu.
18 Dika I zigaram nime uwa, Mu onwem ziga-kwa-ra ha nime uwa.