15 Ekpeghm ekpere ka I wepu ha n'uwa, kama ka I debe ha ka ha pua n'aka ajọ onye ahu.
16 Ha esiteghi n'uwa, dika Mu onwem nēsiteghi n'uwa.
17 Were ezi-okwu do ha nsọ: okwu-Gi bu ezi-okwu.
18 Dika I zigaram nime uwa, Mu onwem ziga-kwa-ra ha nime uwa.
19 N'ihi ha ka Mu onwem nēdo kwa Onwem nsọ, ka ewe do kwa ha onwe-ha nsọ n'ezi-okwu.
20 Ọ bughi kwa nání ndia ka M'nēkpe ekpere bayere ha, kama anamekpe kwa ekpere bayere ndi kwere na Mu site n'okwu-ha;
21 ka ha nile we buru otù; dika Gi onwe-gi di nimem, dika Mu onwem di kwa nime Gi, Nna, ka ha onwe-ha we di kwa nime Ayi: ka uwa we kwere na Gi onwe-gi ziterem.