36 Jisus zara, si, Ala-ezem esiteghi n'uwa nka: ọ buru na ala-ezem sitere n'uwa nka, ndi nējerem ozi gālu ọ̀gù, ka aghara iraram nye n'aka ndi-Ju: ma ub͕u a ala-ezem esighi n'ebe a puta.
37 Ya mere Pailat siri Ya, Gì onwe-gi bu kwa eze? Jisus zara, si, Gi onwe-gi nāsi na Mu onwem bu eze. Amuwo Mu onwem ime ihe a, abiawokwam nime uwa ime ihe a, ka M'we b͕ara ezi-okwu àmà. Onye ọ bula nke sitere n'ezi-okwu ahu nānu olum.
38 Pailat si Ya, Gini bu ezi-okwu?Mb͕e o kwusiri nka, o we pukuru ndi-Ju ọzọ, si ha, Mu onwem ahughi ihe kwesiri ahuhu-nmehie nime Ya.
39 Ma unu nwere ome-n'ala, ka m'rapuru unu otù onye n'ememe ngabiga: ùnu nēzube kwa ka M'rapuru unu Eze ndi-Ju?
40 Ya mere ha tiri nkpu ọzọ, si, Ọ bughi Onye a, kama ọ bu Barabas. Ma Barabas bu onye nāpunara madu ihe.