1 Ya mere mb͕e ahu Pailat were Jisus, pia Ya ihe.
2 Ndi-agha we kpa okpu-eze nke eji ogwu me, ha were ya kpube Ya n'isi, were kwa uwe odobo b͕okwasi Ya;
3 ha we nābiakute Ya, nāsi, Ekele, Eze ndi-Ju! ha nāpia kwa Ya ihe.
4 Pailat we pu kwa ọzọ n'èzí, si ha, Le, anamekuputa Ya n'èzí nye unu, ka unu we mara na ahughim ihe kwesiri ahuhu-nmehie nime Ya.
5 Ya mere Jisus putara n'èzí, nēkpu okpu-eze ahu nke eji ogwu me, nēyi kwa uwe odobo ahu. Pailat we si ha, Le, Nwoke ahu!