1 N'ubọchi nke-atọ ọlulu-nwunye di na Kena nke Galili; nne Jisus nọ kwa n'ebe ahu:
2 ewe kpọ kwa Jisus, Ya na ndi nēso uzọ-Ya, bia n'ọlulu-nwunye ahu.
3 Mb͕e manya-vine kọrọ, nne Jisus we si Ya, Ha enweghi manya-vine.
4 Jisus we si ya, Nwanyi, gini ka Mu na gi nwekọrọ? oge hour nkem akābiarughi.
5 Nne-Ya si ndi nēje ozi, Ihe ọ bula Ọ si unu me, menu ya.
6 Ma adọbara n'ebe ahu ite nkume miri isi, dika ime-ọcha nke ndi-Ju si di, nānagide firkin abua ma-ọbu atọ n'otù.