13 Ndi ahu we si ya, Nwanyi, gini mere i nākwa ákwá? Ọ si ha, N'ihi na ha bupuru Onye-nwem, amatakwaghm ebe ha tọb͕ọrọ Ya.
14 Mb͕e o kwusiri okwu ndia, o chigharia, we hu Jisus ka O guzoro, ma ọ mataghi na ọ bu Jisus.
15 Jisus si ya, Nwanyi, gini mere i nākwa ákwá? ònye ka i nāchọ? Nwanyi ahu, ebe ọ nēchè na Ọ bu onye-nche ubi ahu ab͕ara ogige, ọ si Ya, Onye-nwe-ayi, ọ buru na Gi onwe-gi bupuru Ya, gwam ebe I tọb͕ọrọ Ya, mu onwem gēbupu kwa ya.
16 Jisus si ya, Meri. Nwayi ahu chigharia, si Ya n'asusu Hibru, Rabonai; nke bu, Onye-ozizí.
17 Jisus si ya, Emetulam aka; n'ihi na akāmarigogh lakuru Nnam: ma gakwuru umu-nnam, si ha, Anamarigo lakuru Nnam na Nna-unu, na Chinekem na Chineke-unu.
18 Meri Magdalini bia kọrọ ndi nēso uzọ-Ya, si, Ahuwom Onye-nwe-ayi; ọkọ-kwa-ra ha otú Ọ gwara ya-ri ihe ndia.
19 Ya mere mb͕e o ruru anyasi, n'ubọchi ahu, bú ubọchi mbu n'ízù, mb͕e emechi-kwa-ra uzọ nile ebe ndi nēso uzọ-Ya nọ, n'ihi egwu ndi-Ju, Jisus biara guzo n'etiti, si ha, Udo diri unu.