9 N'ihi na ha akāmataghi ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, na Ọ ghaghi isi na ndi nwuru anwu bilie.
10 Ya mere ndi ahu ndi nēso uzọ Jisus laghachiri ọzọ n'ulo nke aka ha.
11 Ma Meri nēguzo n'èzí na nso ílì ahu nākwa ákwá: ya mere, ka ọ nākwa, o ruru ala nyo nime ílì;
12 o we hu ndi-mọ-ozi abua nēyi uwe ọcha ka ha nọduru ala, otù n'isi, otù kwa n'ukwu, n'ebe atọb͕ọrọri aru Jisus.
13 Ndi ahu we si ya, Nwanyi, gini mere i nākwa ákwá? Ọ si ha, N'ihi na ha bupuru Onye-nwem, amatakwaghm ebe ha tọb͕ọrọ Ya.
14 Mb͕e o kwusiri okwu ndia, o chigharia, we hu Jisus ka O guzoro, ma ọ mataghi na ọ bu Jisus.
15 Jisus si ya, Nwanyi, gini mere i nākwa ákwá? ònye ka i nāchọ? Nwanyi ahu, ebe ọ nēchè na Ọ bu onye-nche ubi ahu ab͕ara ogige, ọ si Ya, Onye-nwe-ayi, ọ buru na Gi onwe-gi bupuru Ya, gwam ebe I tọb͕ọrọ Ya, mu onwem gēbupu kwa ya.