38 Unu enweghi kwa okwu-Ya ka ọ nọgide nime unu: n'ihi na Onye Ya onwe-ya zitere, Onye ahu ka unu onwe-unu nēkweghi
39 Unu nēnyocha ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, n'ihi na unu onwe-unu nēchè na unu nēnwe ndu ebighi-ebi nime ha; ha onwe-ha bu kwa ihe nāb͕aram àmà;
40 unu achọghi kwa ibiakutem, ka unu we nwe ndu.
41 Anaraghi m otuto n'aka madu.
42 Ma amaram unu, na unu enweghi ihu-n'anya Chineke nime onwe-unu.
43 Mu onwem abiawo n'aha Nnam, ma unu anaraghm: ọ buru na onye ọzọ gābia n'aha nke aka ya, onye ahu ka unu gānara.
44 Ùnu onwe-unu si aṅa pu ikwe, ebe unu nānara otuto n'aka ibe-unu, ma otuto nke si n'aka Onye ahu Nke nání Ya bu Chineke bia unu achọghi?