23 (otú ọ di, ub͕ọ ntà di iche iche sitere na Taibirias bia rue ebe ahu nso ebe ha riri achicha ahu mb͕e Onye-nwe-ayi kelesiri ekele):
24 ya mere mb͕e ìgwè madu ahu huru na Jisus anọghi n'ebe ahu, na ndi nēso uzọ-Ya anọghi kwa, ha onwe-ha bàra n'ub͕ọ ntà, we bia Kapanaum, nāchọ Jisus.
25 Mb͕e ha chọputara Ya n'ofè oké osimiri ọzọ, ha si Ya, Rabai, òle mb͕e I biara n'ebe a?
26 Jisus zara ha, si, N'ezie, n'ezie, asi m unu, Unu nāchọm, ọ bughi n'ihi na unu huru ihe-iriba-ama kama ọ bu n'ihi na unu riri ufọdu nime ob͕e achicha ahu, afọ ju kwa unu.
27 Unu alula ọlu inata ihe-oriri nke nāla n'iyì, kama inata ihe-oriri nke nānọgide rue ndu ebighi-ebi, nke Nwa nke madu gēnye unu: n'ihi na Onye ahu ka Nna, bú Chineke, kara akàrà.
28 Ya mere ha siri Ya, Gini kwesiri ka ayi me, ka ayi we lua ọlu Chineke nile?
29 Jisus zara, si ha, Nka bu ọlu Chineke, ka unu kwere n'Onye ahu Ya onwe-ya zitere.