31 Nna-ayi-hà riri manna n'ọhia; dika edeworo n'akwukwọ nsọ, si, Nri nke sitere n'elu-igwe ka O nyere ha ka ha rie.
32 Ya mere Jisus siri ha, N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ bughi Moses nyere unu nri ahu nke sitere n'elu-igwe; kama ọ bu Nnam nēnye unu ezi nri ahu nke sitere n'elu-igwe.
33 N'ihi na nri nke Chineke bu nke ahu nke nēsi n'elu-igwe aridata, nke nēnye kwa uwa ndu.
34 Ya mere ha siri Ya, Onye-nwe-ayi, nye ayi nri a mb͕e nile.
35 Jisus siri ha, Mu onwem bu nri nēnye ndu: onye nābiakutem, agu agaghi-agu ya ma-ọli, onye nēkwere kwa na Mu akpiri agaghi-akpọ ya nku ma-ọli mb͕e ọ bula.
36 Ma asirim unu, na unu ahuwom, ma unu ekweghi.
37 Ihe nile nke Nnam nēnyem gābiakutem; onye nābiakutekwam M'gaghi-achupu ya ma-ọli.