34 Ya mere ha siri Ya, Onye-nwe-ayi, nye ayi nri a mb͕e nile.
35 Jisus siri ha, Mu onwem bu nri nēnye ndu: onye nābiakutem, agu agaghi-agu ya ma-ọli, onye nēkwere kwa na Mu akpiri agaghi-akpọ ya nku ma-ọli mb͕e ọ bula.
36 Ma asirim unu, na unu ahuwom, ma unu ekweghi.
37 Ihe nile nke Nnam nēnyem gābiakutem; onye nābiakutekwam M'gaghi-achupu ya ma-ọli.
38 N'ihi na esiwom n'elu-igwe ridata, ọ bughi ka M'nēme ihe Mu onwem nāchọ, kama ka M'nēme ihe Onye ziterem nāchọ.
39 Ma nka bu ihe Onye ziterem nāchọ, ka M'ghara itufu ihe ọ bula nime ihe nile O nyeworo m, kama ka M'me ka o si n'ọnwu bilie n'ubọchi ikpe-azu.
40 N'ihi na nka bu ihe Nnam nāchọ, ka onye ọ bula nke nēle Ọkpara-Ya anya, nke nēkwere kwa na Ya, we nwe ndu ebighi-ebi; Mu onwem gēme kwa ka o si n'ọnwu bilie n'ubọchi ikpe-azu.