46 Ndi ahu ndi nēje ozi zara, si, Ọ dighi mb͕e ọ bula madu kwuru okwu di otú a.
47 Ya mere ndi-Farisi zara ha, si, Èduhiewo kwa unu onwe-unu?
48 Ọ̀ di onye ọ bula n'etiti ndi-isi, ma-ọbu n'etiti ndi-Farisi, kwere na Ya?
49 Ma ìgwè madu a nke nāmaghi iwu-ayi bu ndi anābu ọnu.
50 Nikọdimọs si ha (onye biakutere Ya na mbu, ebe ọ bu otù onye nime ha),
51 Ìwu-ayi nēkpe madu ikpé, ọ buru na o bughi uzọ nu n'ọnu-ya, we mara ihe ọ nēme?
52 Ha zara, si ya, Gì onwe-gi si kwa na Galili puta? Nyocha n'akwukwọ nsọ, le kwa na ọ dighi onye-amuma si na Galili bilie.