33 Ha zara Ya, si, Ayi bu nkpuru Abraham, ọ kādighi kwa mb͕e ọ bula ayi bu orù onye ọ bula: Gì onwe-gi si aṅa kwu, Agēme ka unu pua n'orù?
34 Jisus zara ha, si, N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye ọ bula nke nēmehie bu orù nmehie.
35 Ma orù adighi-anọgide n'ulo rue mb͕e ebighi-ebi: nwa nānọgide ebighi-ebi.
36 Ya mere ọ buru na Ọkpara gēme ka unu pua n'orù, unu gābu ndi puworo n'orù n'ezie.
37 Amataram na unu bu nkpuru Abraham; ma unu nāchọ uzọ ib͕um, n'ihi na okwum enweghi ọnọdu nime unu.
38 Anamekwu ihe Mu onwem huworo n'ebe Nnam nọ: ya mere unu onwe-unu nēme kwa ihe unu nuru n'ọnu nna-unu.
39 Ha zara, si Ya, Nna-ayi bu Abraham. Jisus si ha, Ọ buru na unu bu umu Abraham, unu gālu ọlu Abraham.