14 Ọ bu kwa ndia ka Inok, bú onye-asa site n'Adam, buru amuma, si, Le, Onye-nwe-ayi biara Ya na ndi nsọ Ya, anāpughi iguta ọnu,
15 ikpe madu nile ikpé, na itu ndi nile ndi nāsọpurughi Chineke ihe n'anya, bú ọlu nile nke asọpughi-Chineke ha nke ha luru n'asọpughi-Chineke, ha na okwu di ike nile nke ndi-nmehie ndi nāsọpurughi Chineke kwugidere Ya.
16 Ndia bu ndi-ntamu, ndi nāta Chineke uta, nējeso agu ihe ọjọ nile ha (ọnu-ha nēkwu kwa oké okwu nāfuli afuli), ndi nāja iru madu n'ihi urù.
17 Ma unu onwe-unu, ndi m'huru n'anya, chetanu okwu nile nke ndi-ozi Onye-nwe-ayi Jisus Kraist buru uzọ kwu;
18 na ha siri unu, N'oge ikpe-azu ndi-ọchì gādi, nāga dika agu ihe ọjọ nile nke aka ha nke asọpughi-Chineke si di.
19 Ndia bu ndi nākpata nkewa, ndi nkpuru-obi madu nāchi, ndi nēnweghi Mọ Nsọ.
20 Ma unu onwe-unu, ndi m'huru n'anya, n'iwuli onwe-unu elu dika ulo n'elu okwukwe-unu dikarisiri nsọ, n'ikpe kwa ekpere nime Mọ Nsọ,