27 Nání nēbinu obi dika ndi ala elu-igwe n'uzọ kwesiri ozi ọma nke Kraist: ka ọ gābu, ma m'bia hu unu ma-ọbu na anọghm, ka m'we nu ihe bayere ọnọdu-unu, na unu nēguzosi ike n'otù Mọ Nsọ, nēwere kwa otù nkpuru-obi lukọrọ okwukwe nke ozi ọma ahu ọ̀gù si-ike;
28 ghara ikwe ka ndi nēmegide unu me ka unu tua ujọ n'ihe ọ bula: ebe nke ahu bu ihe nēme ka ila-n'iyì putara ha ìhè, ma ọ nēme ka nzọputa-unu puta ìhè, nka site-kwa-ra na Chineke;
29 n'ihi na unu ka enyeworo ya n'amara n'ihi Kraist, ọ bughi nání ikwere na Ya, kama ihu kwa ahuhu n'ihi Ya:
30 ebe unu nwere otù nb͕a ahu nke unu huru n'arum, ub͕u a ka unu nānu kwa na ọ di n'arum.