11 Ọ bughi na anamekwu okwu bayere nkpà: n'ihi na mu onwem mutara, n'ọnọdu ọ bula m'nọ, inwezu nime ya ihe nile nākpam nkpà.
12 Amataram uzọ iweda onwem, amata-kwa-ram uzọ ibabiga ókè: n'ihe ọ bula na n'ihe nile ezíwo mu ihe-omimi a, bú inọ n'afọ-ojuju na inọ kwa n'agu, ibabiga ókè na inọ kwa na nkpà.
13 Enwerem ike n'ihe nile nime Onye ahu Nke nēmem ka m'di ike.
14 Otú ọ di, unu mere nke-ọma, n'isom nwekọ nkpab͕um.
15 Ma unu onwe-unu makwara, ndi Filipai, na nime nmalite nke ozi ọma, mb͕e m'siri na Masedọnia puta, ọ dighi nzukọ Kraist ọ bula nke mu na ya nwekọrọ ihe n'okwu bayere onyinye na ọnina, ma-ọbughi nání unu onwe-unu;
16 n'ihi na ọbuná na Tesalọnaika unu zigara otù mb͕e ziga kwa mb͕e ọzọ ib͕om nkpà.
17 Ọ bughi na anamachọ onyinye ahu; kama anamachọ nkpuru ahu nke nāba uba iguyere unu.