15 Ma mb͕e ọ di Chineke ezi nma, bú Onye sitere n'oge m'nọ n'afọ nnem kewaputam, site kwa n'amara-Ya kpọm,
16 mb͕e ọ di Ya ezi nma ikpughe Ọkpara-Ya nimem, ka m'we zisa ozi ọma Ya n'etiti ndi mba ọzọ; ngwa ngwa mu na anu-aru na ọbara ab͕aghi ìzù:
17 arigoghm kwa na Jerusalem jekuru ndi burum uzọ buru ndi-ozi: kama ejerem Arebia; we laghachi na Damaskọs ọzọ.
18 Mb͕e ahu mb͕e arọ atọ gasiri arigorom na Jerusalem ileta Kifas, mu na ya we nọgide ubọchi iri na ise.
19 Ma ahughm onye ọzọ n'etiti ndi-ozi, ma ọ bu nání Jemes nwa-nne Onye-nwe-ayi.
20 Ma ihe ndia nke m'nēdegara unu, le, n'iru Chineke, na ekwughm okwu-ugha.
21 Mb͕e ahu abiarurum akuku nile Siria na Silisia.