8 (n'ihi na Onye lusiri Pita ọlu ike ka ọ we lua ọlu onye-ozi nke ndi obibì-úgwù, Onye ahu lusikwara m ọlu ike ka m'we jekuru ndi mba ọzọ);
9 mb͕e ha hukwara amara enyerem, Jemes na Kifas na Jọn, bú ndi akpọrọ ide, nara mu na Banabas aka-nri nke nnwekọ, ka ayi onwe-ayi we jekuru ndi mba ọzọ, ka ha onwe-ha we jekuru kwa ndi obibì-úgwù;
10 ọ bu nání na ha chọrọ ka ayi cheta ndi-obeye; nke m'nuru ọku n'obi ime otù ihe ahu.
11 Ma mb͕e Kifas biaruru Antiọk, eguzogiderem ya n'iru, n'ihi na ọ nọ n'ọmuma-ikpé.
12 N'ihi na mb͕e madu ufọdu akēsighi n'ebe Jemes nọ bia, ya na ndi mba ọzọ nērikọ ihe: ma mb͕e ha biara, o wezugabara we kewapu onwe-ya, ebe ọ nātu egwu ndi obibì-úgwù.
13 Ndi-Ju fọduru we so ya n'inwe kwa iru-abua; nke mere ka iru-abua-ha dọrọ Banabas onwe-ya iso ha.
14 Ma mb͕e m'huru na ha agazighi dika ezi-okwu nke ozi ọma si di, asirim Kifas n'iru ha nile, Ọ buru na gi onwe-gi adi ndu dika ndi mba ọzọ, ma ọ bughi dika ndi-Ju, ọ bu ezie na i bu onye-Ju, ì si aṅa erugide ndi mba ọzọ ka ha so uzọ ndi-Ju?