20 Ma onye-ob͕ub͕o abughi nke otù onye; ma Chineke bu otù onye.
21 Ya mere, ìwu ahu nēmegide nkwa Chineke? Chineke ekwela: n'ihi na asi na enyereri iwu nke puru ime ka adi ndu, n'ezie ezi omume gēsitewori n'iwu.
22 Otú ọ di, ihe edeworo n'akwukwọ nsọ mechibidoro ihe nile n'okpuru nmehie, ka ewe were nkwa ahu nke sitere n'okwukwe ekwere na Jisus Kraist nye ndi kwere ekwe.
23 Ma mb͕e okwukwe akābiaghi, anēche ayi nche n'okpuru iwu, ebe anēmechibido ayi rue okwukwe ahu nke agaje ikpughe.
24 Ya mere iwu ahu aghọwo onye-ozìzí-ayi ikpọrọ ayi biakute Kraist, ka ewe site n'okwukwe gua ayi na ndi ezi omume.
25 Ma ebe okwukwe ahu biaworo, ayi anọghi ọzọ n'okpuru onye-ozizí.
26 N'ihi na unu nile bu umu Chineke, site n'okwukwe, nime Kraist Jisus.