6 Dika Abraham kwere Chineke, ewe gua nke ahu nye ya n'ezi omume.
7 Ya mere maranu na ndi sitere n'okwukwe, ndi ahu bu umu Abraham.
8 Ma ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, ebe o buru uzọ hu na Chineke nēsite n'okwukwe gu ndi mba ọzọ na ndi ezi omume, o buru uzọ zìe Abraham ozi ọma, si, Agāgọzi mba nile nime gi.
9 Ya mere ndi sitere n'okwukwe, ndia ka anāgọzi, ha na onye okwukwe ahu, bú Abraham.
10 N'ihi na ka ha ra, bú ndi sitere n'ọlu nke iwu, ha nọ n'okpuru ọbubu-ọnu: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye anābu ọnu ka ọ bu, bu onye ọ bula nke nānọgideghi n'ihe nile edeworo n'akwukwọ iwu, ime ha.
11 Ma ọ putara ìhè na ọ dighi onye ọ bula anāgu n'onye ezi omume n'iwu n'iru Chineke: n'ihi na, Onye ezi omume gēsite n'okwukwe di ndu;
12 ma iwu ahu esiteghi n'okwukwe; kama, Onye nēme ihe ndia gādi ndu nime ha.