12 Umu-nnam, ariọm unu, menu onwe-unu ka unu di ka mu onwem, n'ihi na mu onwem me-kwa-ra onwem ka m'di ka unu onwe-unu. Unu emeghm ajọ omume ọ bula:
13 ma unu matara na ọ bu n'ihi adighi-ike nke anu-aru ka m'zìri unu ozi ọma na mbu:
14 unu akpọghi kwa ihe di n'anu-arum nke bu ọnwunwa n'ebe unu nọ ihe-efu, ọ sọghi kwa unu oyi; kama unu naram nke-ọma dika mọ-ozi nke Chineke, dika Kraist Jisus.
15 Òle ebe ọ di kwa, bú ọkpukpọ unu nākpọ onwe-unu ndi ngọzi diri? n'ihi na ab͕aram unu àmà, na, ọ buru na ọ bu ihe unu puru ime, unu gāghuputawori anya-unu nyem.
16 Ya mere àghọwom onye-iro-unu, n'ihi na anamagwa unu ezi-okwu?
17 Ha were obi nānu ọku chọ unu n'uzọ nādighi nma; ma ha nāchọ imechibido unu uzọ n'èzí, ka unu we were obi nānu ọku chọ ha.
18 Ma ọ di nma ka ewere obi nānu ọku chọ unu n'ihe ọma mb͕e nile, ọ bughi kwa nání mb͕e m'nọ n'etiti unu.