4 Atọpuru unu n'aru Kraist, unu ndi nāchọ ka ewere iwu gua unu na ndi ezi omume; unu siri n'amara dapu.
5 N'ihi na ayi onwe-ayi ji Mọ Nsọ nēchesi ihe anēle anya ike, bú ezi omume, site n'okwukwe.
6 N'ihi na nime Kraist Jisus ọ dighi ike ọ bula obibì-úgwù ma-ọbu ebìghi-úgwù nwere; kama nke nwere ike bu okwukwe nke sitere n'aka ihu-n'anya alusi ọlu ike.
7 Unu nāb͕arì ọsọ nke-ọma; ònye b͕ochiri unu, ka unu ghara ikweyere ezi-okwu ahu?
8 Nkweye ahu emere ka unu kweye esiteghi n'Onye ahu Nke nākpọ unu.
9 Ihe-iko-achicha di ntà nēko ob͕e utu ọka agwọrọ agwọ dum.
10 Mu onwem atukwasiwo obim n'ebe unu nọ nime Onye-nwe-ayi, na unu agaghi-atukwasi uche n'ihe ọ bula ọzọ: ma onye nēme ka obi lọ unu miri gēbu ikpé-ya, onye ọ bula.